Monday 7 December 2020

IJE MUNA NDI UWE OJII(POLICE MEN) UBOCHI MONDAY 07/12/2020-- We want a Reformed Nigeria Police that will imitate ACP Rabiu Garba.

IJE MUNA NDI UWE OJII(POLICE MEN) NA UBOCHI MBU NI IME UZU UKA A(MONDAY) 07/12/2020

*We want a Reformed Nigeria Police that will imitate ACP Rabiu Garba, WE DONT HATE WHAT WE LIKE*

*We are expecting to have a Refined Nigerian Police Force, that can easily discharge their duty in friendly manner with the people they are working for without Intimidation, Turture and Brutality. ust my humble Submission and that's when our Democracy is strengthen for a new Nigeria we are yawning for, PERIOD, QED* 


Biko Ndibeanyi kee mgbe ise ihe onyoonyo(snapping Picture) na ebe enwere ogba aghara, ma obu ebe ndi uwe ojii na achu ndo ohi, ji burukwa ida iwu na Naijiria???

Nee kwanu m bu Evangelist Ositadimma Luke Iloghalu ka m sicha Uka Ututu(Morning mass) na abata oooh.
Ooo kwo ka m kpochaaru onye nnochite anyi na ulo omebi iwu nke Anambra State(ASHA)) bu Hon Bar Uzoma Eli muna ya nwechaa mkparita uka gbasaaru akwukwo bill m dere, ejere nyechaa Olikagu, nya na onye isi APGA ward 1 Fegge bu Hon Ben Onyebuchi akwukwo bill a, m deputara gbasara "Uzo ka mma isi wee na akwuzi IGR Anambra State na Office ndi IGR,  kama ina anako ya bu IGR na okporo uzo", dika DPO Fegge ACP Rabiu Garba si wee nye anyi bu ndi EKYMI ntuzi aka, ga aka-mma, mgbe anyi jesiri hu ya na izu uka garu aga(last week).

Dike m nyesiri Olikagu akwukwo bill  nke ya ooo, ka mpubazie, mu wee nuba uda egbe, ya na ka ndi Mmadu na agbaputakwa ka ha maaru ihe na eme.
Dika onye na aruru goomenti Anambra State oru, ejebere m nso, wee hu na obu ndi ohi ka ana achu oso. Esokwa m wee chuo ha oso a. Na ikpeazu onweru onye nke mbu ejidere ka oji egbe. Achubakwara onye nke abuo, dika onye ana-enyo enyo ka-oso ndi ohi ahu. Anyi nile ji anuri kpuru onye nke a ana enyo na aputa. Dika "onye oru nchu-nta akuko"(a Journalist) eweeru m ekwe nti(Phone) mu wee see ihe na eme ebea anyi no. 
Imakwa na ndi iwu ojii(Police), mu che na muna ha na aruko oru, bidoro kuba m ihe oo. 

Ano m na akowaru ha na m so aruru Governor  Anambra State bu Chief Willie Obiano oru, na muna DPO Fegge bu Garba Rabiu na arukokwa oru onu, mana ndi a achooghi ige m nti, ha naaru ekwe-nti(phone) m, ma na aku m ihe oo.
Ihe ha meeru bu na ha tunyere kotaru muna onye ohi a, ana enyo enyo iga igwe(hancuf) tinye anyi na ime keeke.
Mbo nile mgbaru ka nweta DPO Fegge Rabiu Garba na ekwe nti(phone) fiaru ahu makana ha naaru m ekwe nti m.
Mana agbaru m Olikagu nya bia ka etinye okwu onu na Fegge Police Station, ma ahughi m ya.

Nke ka wute m buna, na enebeghi anya na nkpesa nile mkpesaara ndi iwu ojii ahu, anom na ime uno -ochiche-obereoge ndi iwu ojii(Police cell) karia elekele ugboro isi(six hours). 
Mgbem m nuru na DPO Fegge abiago, akporu onye Police na ahu maka cell, mana ahughi m ya; eji iga(key) di na cell ahu na aku na cell ka ha wee nu; imakwa na ofu onye iwu ojii office ya di nso ebe ahu, weeru nnukwu udo-oku(baable wire) bia kuba m, sina na m na eme nkpotu na cell, nke a bu ahuchaaa ahudobe!!!!

Onye iwu ojii(Police) a kurum ihe a daalu ezigbota "iwu imegide ikike inwere onwe nke Mmadu" maka oweeru na onyeghi ihe onye ahu ga emenwu(Turture, Brutalization and Intimidation).
Nke a megidere iwu ikike diiri mmadu nke mba uwa(Against Internaional Human Rights), ya bu na ekwesiri ka ataa onye iwu ojii ahuhu dika iwu si wee kwuoo.


Obu ka elekele ole ma ole ji wee gachaa akara oge nke ino(4pm) ka nwata nwanyi na ahu maka cell ji wee kpoo m, onye iwu oji ji ekwe nti wee weteru m ya.

Agwakwaziri m ya na achoru ifu DPO. Obuzi ka m huchara DPO Rabiu Garba ka ogwaaru ha hapunu, mu wee naba na ebi mbi di ka ochuchara elekele nke ise(5pm) nke mgbede.

Nke a buka nsi wee zu ahia nke taata oooh


Umu Igbo bu Igbo obi adighi m mma, tuoranu aro ihe ozo nge eme ugbu a maka ihe di njo di njo.

Daalu nu umu nwanne m.




Evangelist Ositadimma Luke Iloghalu(Executive Assistant to Governor Willie Obiano and Founder/General Leader Ego Kristi Youth Movement International"EKYMI")

1 comment:

  1. I read everything. Hmmmmmmmmmm, if everything happened just as you wrote, then there is brutality, injustice, and intimidation on the side of the police

    ReplyDelete